20Ma mgbe ọ na-anwụ, ndị inyom na-eji ya ime, sịrị ya, “Atụla egwu, adala mba, ị mụọla nwa nwoke.” Ma ọ zaghị ha ihe ọbụla. Ọ ṅakwaghị ha ntị.
21Ọ gụrụ nwantakịrị aha, kpọọ ya Ịkabọdụ, kwuo sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ,” nʼihi obubu e buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, na nʼihi ọnwụ nna di ya na di ya.
22O kwuru sị, “Ebube esitela nʼIzrel pụọ, nʼihi na e buuru igbe Chineke.”