1 Samuel 5

Mgbe ndị Filistia buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, ha si Ebeneza buru ya buga Ashdọd.

1 Samuel 5:1 (UKJV) And the Philistines took the ark of God, and brought it from Ebenezer unto Ashdod.

1Mgbe ndị Filistia buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, ha si Ebeneza buru ya buga Ashdọd.

2Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn, dọba ya nʼakụkụ Dagọn.

3Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.