1 Samuel 4

ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, “Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga.

1 Samuel 4:7 (UKJV) And the Philistines were afraid, for they said, God has come into the camp. And they said, Woe unto us! for there has not been such a thing in time past.

5Mgbe e bubatara igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nʼebe ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu ha, ndị Izrel tiri mkpu mere ka ala maa jijiji.

6Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, “Gịnị na-eme? Ọ bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?” Mgbe a gwara ha na ọ bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị erutela,

7ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, “Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga.

8Ahụhụ dịrị anyị! Onye ga-anapụta anyị site nʼaka chi ndị a dị ike? Nʼihi na ọ bụ chi ndị a ji ihe otiti dị iche iche tie ndị Ijipt mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara.

9Unu dị ike, unu ndị Filistia, bụrụkwanụ ndị ikom, ma ọ bụghị otu a, unu ga-aghọ ohu ndị Hibru dịka ha bụụrụ unu ndị ohu. Bụrụnụ ndị ikom, lụọ agha!”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.