6Mgbe ndị Filistia nụrụ ụda mkpu a, ha jụrụ sị, “Gịnị na-eme? Ọ bụ gịnị kpatara oke iti mkpu a nʼụlọ ikwu ndị Hibru?” Mgbe a gwara ha na ọ bụ nʼihi na igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị erutela,
7ụjọ tụrụ ndị Filistia. Ha sịrị, “Chi abatala nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ. Ahụhụ dịrị anyị nʼihi na ihe dị otu a emetụbeghị nʼoge gara aga.
8Ahụhụ dịrị anyị! Onye ga-anapụta anyị site nʼaka chi ndị a dị ike? Nʼihi na ọ bụ chi ndị a ji ihe otiti dị iche iche tie ndị Ijipt mgbe ụmụ Izrel nọ nʼọzara.
9Unu dị ike, unu ndị Filistia, bụrụkwanụ ndị ikom, ma ọ bụghị otu a, unu ga-aghọ ohu ndị Hibru dịka ha bụụrụ unu ndị ohu. Bụrụnụ ndị ikom, lụọ agha!”
10Ndị Filistia lụrụ ọgụ dịka dike, lụgbuo ndị Izrel. Ndị agha ji ụkwụ eje ọgụ ọnụọgụgụ ha dị iri puku atọ nwụrụ nʼotu ụbọchị ahụ. Ma ndị fọdụrụ gbalara nʼụlọ ikwu ha.