1 Samuel 5

Ndị na-anwụghị ka e mere ka etuto jupụta ha nʼahụ, mkpu akwa nke ndị obodo ahụ ruru eluigwe.

1 Samuel 5:12 (UKJV) And the men that died not were smitten with the emerods: and the cry of the city went up to heaven.

10Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn. Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, “Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!”

11Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ.

12Ndị na-anwụghị ka e mere ka etuto jupụta ha nʼahụ, mkpu akwa nke ndị obodo ahụ ruru eluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.