1 Samuel 5

Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ.

1 Samuel 5:11 (UKJV) So they sent and gathered together all the lords of the Philistines, and said, Send away the ark of the God of Israel, and let it go again to his own place, that it slay us not, and our people: for there was a deadly destruction throughout all the city; the hand of God was very heavy there.

9Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, aka Onyenwe anyị malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ.

10Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn. Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, “Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!”

11Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ.

12Ndị na-anwụghị ka e mere ka etuto jupụta ha nʼahụ, mkpu akwa nke ndị obodo ahụ ruru eluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.