1 Samuel 6

Ndị Bet-Shemesh jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?”

1 Samuel 6:20 (UKJV) And the men of Bethshemesh said, Who is able to stand before this holy LORD God? and to whom shall he go up from us?

18Ha wetakwara oke ọlaedo a dịka ọnụọgụgụ obodo ndị Filistia si dị, bụ nke ndịisi ise ahụ nwere, obodo ndị e wusiri ike, na obodo nta niile ha. Nkume ukwu ahụ ebe a dọkwasịrị igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, bụ ihe akaebe nʼubi Joshua, onye Bet-Shemesh ruo taa.

19Ma Onyenwe anyị tigburu iri ndị ikom asaa nʼetiti ndị Bet-Shemesh nʼihi na ha nyobara anya nʼime igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Nʼihi ya ndị Bet-Shemesh ruru ụjụ nʼihi ndị ahụ niile Onyenwe anyị tigburu.

20Ndị Bet-Shemesh jụrụ sị, “Onye pụrụ iguzo nʼihu Onyenwe anyị, bụ Chineke a dị nsọ? Olee ebe anyị ga-ezigakwa igbe ọgbụgba ndụ a?”

21Ha zipụrụ ndị ozi ka ha gaa gwa ndị Kiriat Jearim sị ha, “Ndị Filistia ezighachila igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Bịanụ buru ya gaa nʼobodo unu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.