1 Samuel 6

Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.”

1 Samuel 6:3 (UKJV) And they said, If all of you send away the ark of the God of Israel, send it not empty; but in any way return him a trespass offering: then all of you shall be healed, and it shall be known to you why his hand is not removed from you.

1Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ nọrọ nʼobodo ndị Filistia ọnwa asaa.

2Emesịa, ndị Filistia kpọrọ ndị nchụaja ha na ndị na-ajụ mmụọ ase jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme banyere igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị? Gwa anyị otu anyị ga-esi zilaga ya nʼala ya.”

3Ndị ahụ zara sị, “Ọ bụrụ na unu ezighachi igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel, unu ezighachila ya nʼaka efu, kama jirinụ onyinye aja ikpe ọmụma zilaga ya. Unu mee nke a, ihe otiti ndị a ga-ala. Unu ga-amatakwa ihe mere o ji na-ata unu ahụhụ ndị a.”

4Ha jụrụ, “Olee ụdị onyinye aja ikpe ọmụma anyị ga-enye.” A gwara ha, “Dịka ọnụọgụgụ ndịisi obodo Filistia si dị ise, unu ga-eziga onyinye oyiyi etuto ise nke e jiri ọlaedo kpụọ na oyiyi oke ise nke e jikwa ọlaedo kpụọ, nʼihi na ọ bụ otu ụdị ihe otiti ahụ ka o ji tie unu na ndịisi obodo unu niile.

5Jiri ọlaedo kpụọ oyiyi etuto na oke ndị ahụ na-emebi ala unu, si otu a nye chi ndị Izrel nsọpụrụ. Ma eleghị anya ọ ga-ewezuga aka ike ya site nʼebe unu na chi unu dị iche iche na ala unu nọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.