9Mee dịka ha rịọrọ, ma echefula ịgwa ha ụdị omume eze ahụ ga-achị ha ga-emeso ha.”
10Samuel gwara ndị Izrel na-arịọ ka e nye ha eze ihe Onyenwe anyị kwuru.
11Ọ zara sị ha, “Ihe ndị a bụ ụdị mmeso eze ahụ ga-achị unu ga-emeso unu: Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị ikom mee ha ndị na-agba ọsọ nʼihu ụgbọ agha ya na ịnyịnya ya.
12Ụfọdụ ka ọ ga-eme ọchịagha, ndị ga-elekọta ọtụtụ puku ndị agha, maọbụ iri ndị agha ise; ndị ụfọdụ ga-abụ ndị ga-akọ ubi ya, ndị ọzọ ga-ewebatakwa ihe owuwe ubi ya, ma ndị ọzọ ga-akpụrụ ya ngwa agha na ihe niile e ji anya ụgbọ agha ya.
13Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị inyom mee ka ha bụrụ ndị na-esiri ya mmanụ otite na-esi isi ụtọ, na ndị na-esiri ya nri, na ndị na-eghere ya ihe oghịghe.