7Onyenwe anyị gwara ya, “Gee ntị nʼihe niile ndị a na-agwa gị; ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ibu eze ha.
8Site nʼụbọchị m mere ka ha si nʼIjipt pụta ruo taa, ha na-agbakụta m azụ, na-efe chi ndị ọzọ. Ọ bụkwa otu a ka ha na-eme gị ugbu a.
9Mee dịka ha rịọrọ, ma echefula ịgwa ha ụdị omume eze ahụ ga-achị ha ga-emeso ha.”
10Samuel gwara ndị Izrel na-arịọ ka e nye ha eze ihe Onyenwe anyị kwuru.
11Ọ zara sị ha, “Ihe ndị a bụ ụdị mmeso eze ahụ ga-achị unu ga-emeso unu: Ọ ga-eduru ụmụ unu ndị ikom mee ha ndị na-agba ọsọ nʼihu ụgbọ agha ya na ịnyịnya ya.