1 Samuel 8

Mgbe ahụ, anyị onwe anyị ga-adị ka ndị mba niile ọzọ, anyị ga-enwe eze ga na-edu anyị, na-aga nʼihu anyị na-ebukwa agha anyị.”

1 Samuel 8:20 (UKJV) That we also may be like all the nations; and that our king may judge us, and go out before us, and fight our battles.

18Mgbe ụbọchị ndị ahụ bịara, mgbe ihe ndị a bidoro imezu, unu ga-akwa akwa, rịọọ ka e wezugara unu eze ahụ unu họpụtaara onwe unu, ma Onyenwe anyị agaghị aṅa unu ntị nʼụbọchị ahụ.”

19Ma ndị Izrel jụrụ ige Samuel ntị. Ha sịrị, “Anyị chọrọ eze ga-achị anyị.

20Mgbe ahụ, anyị onwe anyị ga-adị ka ndị mba niile ọzọ, anyị ga-enwe eze ga na-edu anyị, na-aga nʼihu anyị na-ebukwa agha anyị.”

21Samuel gwara Onyenwe anyị ihe niile ha kwuru.

22Ma Onyenwe anyị zara ya ọzọ sị, “Mee ihe ha kwuru, nye ha eze.” Mgbe ahụ, Samuel gwara ndị ikom Izrel okwu sị ha, “Laanụ, nwoke ọbụla nʼobodo ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.