1 Samuel 8

Ma obi adịghị Samuel ụtọ mgbe ha rịọrọ sị, “Nye anyị eze ga-edu anyị.” Nʼihi ya, Samuel kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere.

1 Samuel 8:6 (UKJV) But the thing displeased Samuel, when they said, Give us a king to judge us. And Samuel prayed unto the LORD.

4Nʼihi ya, ndị okenye ụmụ Izrel niile zukọtara, bịakwute Samuel na Rema sị ya,

5“I meela agadi, ụmụ gị ndị ikom adịghịkwa eso ụzọ gị. Ugbu a họpụtara anyị onye ga-abụ eze anyị, onye ga na-edu anyị, dịka mba ndị ọzọ.”

6Ma obi adịghị Samuel ụtọ mgbe ha rịọrọ sị, “Nye anyị eze ga-edu anyị.” Nʼihi ya, Samuel kpọkuru Onyenwe anyị nʼekpere.

7Onyenwe anyị gwara ya, “Gee ntị nʼihe niile ndị a na-agwa gị; ọ bụghị gị ka ha jụrụ, kama ọ bụ mụ onwe m ka ha jụrụ ibu eze ha.

8Site nʼụbọchị m mere ka ha si nʼIjipt pụta ruo taa, ha na-agbakụta m azụ, na-efe chi ndị ọzọ. Ọ bụkwa otu a ka ha na-eme gị ugbu a.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.