20Enyela obi gị nsogbu maka ịnyịnya ibu ndị ahụ furu efu nʼabalị atọ gara aga, nʼihi na a chọtala ha. Ma, onye ka mmadụ ahụ bụ, onye ndị Izrel niile na-achọsi ike? Ọ bụghị gị na ezinaụlọ nna gị.”
21Ma Sọl zara sị, “Ọ bụghị onye Benjamin ka m bụ, onye sitere nʼebo kachasị nta nʼIzrel; ọ bụghị agbụrụ m dịkarịsịrị nta nʼetiti agbụrụ niile ọzọ dị nʼebo Benjamin? Gịnị mere i ji agwa m ụdị okwu dị otu a?”
22Mgbe ahụ, Samuel duuru Sọl na onyeozi ya kpọbata ha nʼime ụlọ ukwu, nye ha ọnọdụ nʼisi oche nʼetiti iri mmadụ atọ ọ kpọrọ oriri.
23Samuel gwara onyeisi ndị na-esi nri okwu sị, “Weta anụ ahụ m nyere gị, nke ahụ m sị gị ka ị debe iche.”
24Onye na-esi nri weere ụkwụ anụ ahụ na ihe ndị so ya debe ya nʼihu Sọl. Samuel sịrị, “Lee, ihe ndị e wepụrụ ka e debere gị. Rie, nʼihi na e debere gị ya maka oge akara aka, site nʼoge ahụ m kwuru si, ‘Akpọrọ m ndị mmadụ oku nri.’ ” Sọl sooro Samuel rie nri nʼụbọchị ahụ.