5Nʼikpeazụ, mgbe ha chọọrọ ha rute nʼala Zuf, Sọl gwara onyeozi ahụ ya na ya so, sị, “Ka anyị laghachi, nʼihi na ọ bụrụ na nna m elee anya anyị ma ọ hụghị anyị, ọ ga-amalite iche echiche banyere anyị karịa ịnyịnya ibu ndị a.”
6Ma odibo ahụ zara ya sị, “Lee, e nwere otu onye nke Chineke bi nʼobodo a; ọ bụkwa onye mmadụ niile na-asọpụrụ nʼihi na ihe ọbụla o kwuru na-emezu. Ka anyị gaa hụ ya, ma eleghị anya ọ ga-agwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”
7Sọl sịrị odibo ya, “Ọ bụrụ na anyị agaa, gịnị ka anyị ga-enye nwoke ahụ? Nri dị na-akpa anyị agwụla, ọ dịkwaghị onyinye anyị nwere nke anyị ga-enye onye nke Chineke. Gịnị ka anyị nwere?”
8Onyeozi ahụ zara ya ọzọ sị, “Lee, enwere m otu mkpụrụ shekel ọlaọcha. Aga m enye ya onye Chineke a ka ọ gwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”
9(Na mgbe gara aga nʼIzrel, ọ bụrụ na mmadụ agaa iju Chineke ase, ọ na-asị, “Bịa ka anyị jekwuru onye ọhụ ụzọ,” nʼihi na onye a na-akpọ onye amụma taa, ka a na-akpọ onye ọhụ ụzọ nʼoge ahụ).