1Akwụkwọ ozi a si nʼaka Pọl, Saịlas na Timoti. Na-abịara nzukọ dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka amara na udo dịrị unu.
2Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe niile, na-echetakwa unu nʼekpere anyị.
3Mgbe niile ka anyị na-echeta nʼekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nʼokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nʼịhụnanya, na iguzosi ike unu nke sitere nʼolileanya unu nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.
4Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nʼanya nke ukwuu, họpụta unu.