4Ụmụnna anyị, anyị maara na Chineke hụrụ unu nʼanya nke ukwuu, họpụta unu.
5Nʼihi na ọbụghị naanị nke okwu ọnụ ka oziọma anyị rutere unu, kama ọ bụkwa nʼike, na nʼime Mmụọ Nsọ nakwa mmetụta nke dị omimi. Unu maara ụdị ndụ anyị biri nʼetiti unu nʼihi unu.
6Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị. Nʼihi na unu jiri ọṅụ nke Mmụọ Nsọ na-enye nabata oziọma ahụ, nʼagbanyeghị ọtụtụ ahụhụ dị ukwuu nke o wetaara unu.
7Nʼụzọ dị otu a, unu ghọrọ ihe ilere anya nye ndị niile kwere ekwe nọ na Masidonia na Akaịa.
8Ugbu a, e sitela na ndụ unu mee ka oziọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Akaịa. Nʼihi na a na-anụ ihe banyere okwukwe unu nwere na Chineke nʼebe niile. Ya mere, ọ dịkwaghị mkpa ka anyị kwuo ihe banyere ya.