1 Ndị Tesalonaịka 2

Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu.

1 Thessalonians 2:14 (UKJV) For all of you, brethren, became followers of the churches of God which in Judaea are in Christ Jesus: for all of you also have suffered like things of your own countrymen, even as they have of the Jews:

12na-agba unu ume, na-akasị unu obi, na-akwagidekwa unu na unu kwesiri ibi ndụ kwesiri ụmụ Chineke, onye kpọbatara unu nʼime alaeze ya na ebube ya.

13Nʼihi nke a, anyị ga-aga nʼihu na-ekele Chineke na-esepụghị aka, nʼihi na mgbe unu nabatara okwu Chineke, bụ nke unu nụrụ nʼọnụ anyị, unu anabataghị ya dị ka okwu mmadụ, kama otu ọ dịkwa nʼeziokwu, ya bụ okwu Chineke, nke na-arụsikwa ọrụ ike nʼime unu bụ ndị kweere ya.

14Unu onwe unu, ụmụnna m, ghọọnụ ndị na-eṅomi nzukọ nke Chineke nʼime Kraịst Jisọs, ndị nọ na Judịa. Nʼihi na unu onwe unu hụkwara otu ụdị ahụhụ ahụ nʼaka ndị ala unu, dị ka ha onwe ha hụrụ nʼaka ndị Juu.

15Ndị gburu ndị amụma, gbukwaa Onyenwe anyị Jisọs. Ugbu a ha na-akpagbukwa anyị na-achụpụ anyị. Ha na-emegide Chineke na mmadụ niile

16site nʼigbochi anyị izisara ndị mba ọzọ oziọma ka a ghara ịzọpụta ha. Ha na-esite nʼụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịlarị ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.