1Unu onwe unu maara, ụmụnna, na ọbịbịa anyị bịakwutere unu abụghị ihe lara nʼiyi.
2Anyị tara ahụhụ na mbụ e mekwara anyị ihe ihere na Filipai dịka unu maara, ma site nʼinyeaka Chineke anyị nwere obi ike ịgwa unu oziọma ya, ọ bụladị mgbe a na-eguzogide anyị nʼebe ọ dị ukwuu.
3Nʼihi na arịrịọ anyị na-arịọ unu esiteghị na njehie pụta maọbụ nʼọchịchọ nke na-adịghị ọcha ma ọ bụkwanụ nʼaghụghọ.
4Nʼaka nke ọzọ, anyị na-ekwu okwu dị ka ndị ozi Chineke nwapụtara, ndị o tinyere ọrụ oziọma a nʼaka na ntụkwasị obi idebe. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, bụ onye na-enyocha echiche obi anyị.
5Ọ dịghị mgbe ọbụla, dị ka unu maara, anyị kwuru okwu nrafu maọbụ were ụzọ aghụghọ zoo anya ukwu anyị nwere. Chineke bụ onye akaebe anyị.