1 Ndị Tesalonaịka 2

Nʼezie ụmụnna m, amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ hụjuokwa anya nʼetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nʼihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọbụla mgbe anyị na-ezisara unu oziọma Chineke.

1 Thessalonians 2:9 (UKJV) For all of you remember, brethren, our labour and travail: for labouring night and day, because we would not be chargeable unto any of you, we preached unto you the gospel of God.

7Ọ bụ ezie, dị ka ndị ozi Kraịst, anyị gara abụ ibu arụ nye unu. Kama, anyị biri nʼetiti unu site nʼịdị nwayọọ dị ka ndị bụ nne na-azụ ụmụntakịrị ha, na-elekọta ha.

8Nʼihi na anyị hụrụ unu nʼanya nke ukwuu ruo na ọ bụghị naanị na anyị kwusaara unu oziọma Chineke kama anyị nyekwara unu ndụ anyị. Nʼihi na unu dị anyị nʼobi nke ukwu.

9Nʼezie ụmụnna m, amaara m na unu ga-echeta otu anyị si rụọ ọrụ hụjuokwa anya nʼetiti unu. Anyị na-arụ ọrụ ehihie na abalị ịhụ na anyị rụtara ego ga-ezuru anyị, nʼihi na anyị achọghị ịbụ oke ibu nye onye ọbụla mgbe anyị na-ezisara unu oziọma Chineke.

10Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe dị ka Chineke si bụrụ onye akaebe, na mmekọrịta anyị na unu bụ ndị kwere ekwe, bụ nwekọrịta dị ọcha na nke ezi omume, na nke ịta ụta ọbụla na-adịghị na ya.

11Nʼihi na anyị mesoro onye ọbụla nʼime unu dị ka nna si emeso ụmụ nke ya,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.