1Ya mere, mgbe anyị na-apụghị ịnagide ya gaa nʼihu, anyị kpebiri ịnọ naanị anyị nʼAtens.
2Anyị zipụrụ Timoti, onye bụ nwanna anyị, onye anyị na ya so na-arụrụ Chineke ọrụ site nʼịkwusa oziọma Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasịe unu obi, meekwa ka unu guzosie ike nʼokwukwe unu.
3Ka unu hapụ ịda mba nʼihi mkpagbu ndị a a na-akpagbu unu. Ma ana m eche na unu onwe unu maara na nke a ga-abụ ihe nketa anyị.
4Nʼihi na mgbe anyị na unu nọ, anyị buru ụzọ gbaara unu ama na ihe ndị a aghaghị ịbịakwasị unu. Ugbu a, ihe niile emezuola dị ka unu matakwara.