17Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka.
18Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.
19Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ.
20Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya.
21Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike.