19Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ.
20Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya.
21Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike.
22Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.
23Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.