18Ugbu a, Timoti nwa m, ana m enye gị ndụmọdụ a dị ka amụma ahụ e buru banyere gị nʼoge gara aga si dị. Ka ị site nʼịgbaso ya nwe ike ịlụ ezi ọgụ ahụ.
19Jidesie okwukwe i nwere ike, ya na ezi akọnuche. Nʼihi na ụfọdụ ajụla ezi akọnuche ma si otu a dapụ nʼokwukwe.
20Haimeniọs na Alegzanda so na ndị a. Ewerela m ha nyefee Ekwensu nʼaka, ka ọ taa ha ahụhụ tutu ruo mgbe ha mụtara na ha ekwesighị ikwu okwu nkwulu megide Chineke.