1 Timoti 2

Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile,

1 Timothy 2:1 (UKJV) I exhort therefore, that, first of all, supplications, prayers, intercessions, and giving of thanks, be made for all men;

1Na mbụ, ana m arịọ ka e kpee ekpere, kwuchite ọnụ ndị ọzọ nʼekpere, ma nye ekele nʼisi mmadụ niile,

2kpee ekpere maka ndị eze niile, na ndị niile nọ nʼọnọdụ ọchịchị, ka anyị nwee ike bie ndụ udo na nke nsogbu na-adịghị, nʼime ịsọpụrụ Chineke dị ka ọ chọrọ.

3Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke Onye nzọpụta anyị ezi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.