1 Timoti 3

Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.

1 Timothy 3:16 (UKJV) And without controversy great is the mystery of godliness: God was manifest in the flesh, justified in the Spirit, seen of angels, preached unto the Gentiles, believed on in the world, received up into glory.

14Enwere m olileanya na m ga-abịa ileta gị na mgbe na-adịghị anya, ma ana m edere gị ihe ndị a.

15Asị na m enweghị ike bịa ọsịịsọ, ị ga-amata otu ndị mmadụ kwesiri isi bie obi nʼezinaụlọ Chineke, nke bụ nzukọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ntọala nke eziokwu ahụ.

16Karịchasịa nke a, ọ bụ ihe omimi dị ukwuu, bụ ntọala ebe ezi ịdị nsọ si walite: Ọ pụtara ihe nʼụdịdị mmadụ, Mmụọ Nsọ gosiri na ọ bụ onye ezi omume, ndị mmụọ ozi hụrụ ya, e kwusara ihe banyere ya nye mba niile, ụwa niile kwenyeere na ya, a nabatakwara ya nʼebube nke eluigwe.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.