1Nke a bụ okwu kwesiri ntụkwasị obi ma bụrụkwa eziokwu, bụ nke na-asị, ọ bụrụ na onye ọbụla na-achọ ọnọdụ ịbụ ụkọchukwu, ọ na-achọ ezi ọrụ kacha mma.
2Ya mere onye ụkọchukwu kwesiri ịbụ onye a na-adịghị ata ụta, onye lụrụ otu nwunye, onye obi umeala, onye na-achịkọta onwe ya nke ọma, onye nwere nsọpụrụ, onye na-anabata ndị ọbịa nʼụlọ ya, nakwa onye nwere ike ikuzi ihe.
3Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, ọ gaghị abụ onye na-alụkarị ọgụ, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ, onye na-ahụghị okwu na ụka nʼanya, na onye na-adịghị ahụ ego nʼanya.
4Ọ ga-abụ onye na-achịzi ezinaụlọ ya nke ọma, bụrụkwa onye na-achịkwa ụmụ ya inwe nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla.