5(Nʼihi na ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike chịkọtazie ezinaụlọ ya, ọ ga-esi aṅaa chịzie chọọchị Chineke?)
6Ọ gaghị abụ onye chegharịrị ọhụrụ, ma ọ bụghị ya, ọ ga-afụlị onwe ya elu nʼịnya isi, ma si otu a daba nʼọmụma ikpe dị ka ekwensu.
7Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu.
8Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ, ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi.
9Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.