7Ọ ga-abụkwa onye nwere ezi ama nʼebe ndị nọ nʼezi nọ, ka ọ ghara ịdaba nʼọnọdụ ihere nakwa nʼọnya ekwensu.
8Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị kwesiri nsọpụrụ, ndị na-enweghị ire abụọ, ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị akpịrị ego na-agbaso uru nʼezighị ezi.
9Ha ga-abụ ndị ji akọnuche dị ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.
10Tupu a họpụta ha ịrụ ọrụ a, a ga-ebu ụzọ nwalee ha. Ọ bụrụ na ha enweghị ebubo ọbụla megide ha, mgbe ahụ, a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.
11Otu aka ahụ kwa, ndị nwanyị kwesikwara ịbụ ndị nwere nsọpụrụ nʼụzọ ọbụla, ndị na-adịghị ebu iro nʼobi, ndị na-adịghị agba asịrị, kama ndị nwere obi umeala, na ndị kwesiri ntụkwasị obi nʼihe niile.