11Ma o kwesighị ka e debanye aha ụmụ agbọghọ di ha nwụrụ nʼotu ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ. Nʼihi na mgbe ọchịchọ anụ ahụ jidesiri ha ike, ha ga-enupuru Kraịst isi, chọwa ịlụ di ọzọ.
12Ụdị omume a ga-ewetara ha ikpe ọmụma, nʼihi na ha emezughị nkwa ha kwere na mbụ.
13Wezugakwarị nke a, na ha amụta omume ịdị umengwụ, nʼaga nʼụlọ dị iche iche. Ọ bụghị naanị na ha bụ ndị na-adịghị arụ ọrụ, kama ha na-etinye anya nʼihe na-agbasaghị ha, na-akpa asịrị, na-ekwu okwu nzuzu, na-ekwu ihe ha ekwesighị ikwu.
14Nʼihi nke a, ana m adụ ndị ụmụ agbọghọ ndị a di ha nwụrụ ọdụ ka ha lụrụ di ọzọ, mụọkwa ụmụ, ma na-elekọtazikwa ezinaụlọ ha anya nke ọma. Ọ bụrụ na ha mee nke a, ọ dịghị onye iro ọbụla ga-ekwu okwu ọjọọ megide anyị.
15Ụfọdụ ndị mmadụ adahielarị ụzọ, soro ekwensu.