1 Timoti 5

Na-emeso ndị inyom ndị bụ okenye omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche nʼịdị ọcha nʼebe o zuruoke.

1 Timothy 5:2 (UKJV) The elder women as mothers; the younger as sisters, with all purity.

1Abarala okenye mba nʼolu dị ike, kama jiri arịrịọ na nsọpụrụ gwa ya okwu dị ka ọ bụ nna gị. Na-agwa ụmụ okorobịa okwu dị ka ị ga-esi gwa ụmụnne gị ị hụrụ nʼanya okwu.

2Na-emeso ndị inyom ndị bụ okenye omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche nʼịdị ọcha nʼebe o zuruoke.

3Sọpụrụnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị na-ebi ndụ dị ka ndị di ha nwụrụ anwụ nʼeziokwu.

4Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.