2Na-emeso ndị inyom ndị bụ okenye omume dị ka ndị nne, ma na-emesokwa ụmụ agbọghọ omume dị ka ị ga-esi mesoo ụmụnne gị nwanyị omume. Na-echekwa uche nʼịdị ọcha nʼebe o zuruoke.
3Sọpụrụnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ, ndị na-ebi ndụ dị ka ndị di ha nwụrụ anwụ nʼeziokwu.
4Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.
5Nwanyị di ya nwụrụ nʼezie, nke na-enweghị onye na-elekọta ya anya, atụkwasịla obi ya na olileanya na Chineke. Ọ na-anọgidekwa nʼekpere na arịrịọ ehihie na abalị.
6Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.