4Kama ọ bụrụ na nwanyị ọbụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, maọbụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesiri ibu mkpa ha. Nʼihi na anyị kwesiri isite nʼụlọ anyị gosi obiọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nʼihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.
5Nwanyị di ya nwụrụ nʼezie, nke na-enweghị onye na-elekọta ya anya, atụkwasịla obi ya na olileanya na Chineke. Ọ na-anọgidekwa nʼekpere na arịrịọ ehihie na abalị.
6Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.
7Nye ha ihe ndị a dịka iwu, ka ha ghara ị bụ ndị a na-ata ụta.
8Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.