1 Timoti 5

Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.

1 Timothy 5:8 (UKJV) But if any provide not for his own, and specially for those of his own house, he has denied the faith, and is worse than an infidel.

6Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nʼaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụrịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.

7Nye ha ihe ndị a dịka iwu, ka ha ghara ị bụ ndị a na-ata ụta.

8Onye ọbụla na-adịghị egboro ndị ikwu ya, karịchasịa ndị ezinaụlọ nke aka ya ihe na-akpa ha mkpa, ajụla okwukwe ahụ ma jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe na njọ.

9Nwanyị ọbụla di ya nwụrụ ga-aba nʼotu ndị di ha nwụrụ ga-abụ onye gbara iri afọ isii maọbụ karịa. Ọ ga-abụkwa onye lụrụ naanị otu di.

10Ọ ga-abụ onye mmadụ niile na-agbara ezi ama, nʼihi ezi ọrụ ọ rụrụ. Ọ ga-abụ onye zụlitere ụmụ ya nʼụzọ ziri ezi, onye na-elezi ndị ọbịa anya, onye na-enyere ndị ọrịa na ndị merụrụ ahụ aka, onye na-asa ụkwụ ndị nsọ na onye jikeere mgbe niile ime ihe ọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.