1 Timoti 6

Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu

1 Timothy 6:13 (UKJV) I give you charge in the sight of God, who replenishes life to all things, and before Christ Jesus, who before Pontius Pilate witnessed a good confession;

11Ma gị bụ onye nke Chineke, gbaara ihe ndị a niile ọsọ. Ma chụsoo ezi omume na iyi Chineke, na okwukwe, na ịhụnanya, na ntachiobi, na ịdị nwayọ.

12Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe.

13Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu

14ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe.

15Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.