1 Timoti 6

Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.

1 Timothy 6:15 (UKJV) Which in his times he shall show, who is the blessed and only Potentate, the King of kings, and Lord of lords;

13Nʼihu Chineke, onye na-enye ihe niile ndụ, na nʼihu Kraịst Jisọs onye gbara ama nkwupụta ọma nʼihu Pọntiọs Pailet. Ana m enye gị iwu

14ka i debezuo ihe niile e nyere nʼiwu na-enweghị ntụpọ ọbụla maọbụ ịta ụta ruo mgbe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-apụta ihe.

15Nke a ga-emezu mgbe oge zuru site nʼike ya, Chineke, onye dị ngọzị na onye naanị ya na-achị, Eze kachasị eze niile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.

16Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen.

17Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.