1 Timoti 6

Nʼụzọ dị otu a, ha na-akpadoro onwe ha akụ nke ga-abụrụ ha ntọala siri ike nʼọgbọ dị nʼihu, nke a ga-eme ka ha rite ndụ ahụ nke bụ ezigbo ndụ nʼuru.

1 Timothy 6:19 (UKJV) Laying up in store for themselves a good foundation against the time to come, that they may lay hold on eternal life.

17Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ.

18Gwa ha ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya nʼọrụ ọma niile, ka ha nwee obiọma na inyere ndị ọzọ aka, dịkwa njikere ikenye ndị ọzọ ihe site nʼihe ha nwere.

19Nʼụzọ dị otu a, ha na-akpadoro onwe ha akụ nke ga-abụrụ ha ntọala siri ike nʼọgbọ dị nʼihu, nke a ga-eme ka ha rite ndụ ahụ nke bụ ezigbo ndụ nʼuru.

20Timoti chebekwa ihe ndị ahụ e nyefere gị nʼaka, wezuga onwe gị site nʼokwu nzuzu nke rụrụ arụ, na ịrụ ụka nzuzu nke ha na-akpọ ihe ọmụma,

21bụ nke ụfọdụ kwupụtara, ma na ime nke a, ha esitela nʼụzọ okwukwe kpafuo. Ka amara dịnyere gị. Amen.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.