5na isi ịrụ ụka niile nke na-esite nʼaka ụmụ mmadụ ndị echiche ha na-enweghịkwa eziokwu. Ha na-eche na ife Chineke bụ ụzọ e si aba ọgaranya.
6Ma ikpere Chineke bara uru nke ukwuu nye onye nwere afọ ojuju nʼihe ọbụla o nwere.
7Nʼihi na o nweghị ihe anyị ji nʼaka mgbe anyị bịara nʼụwa, otu a kwa, o nweghị ihe anyị ga-ewerekwa mgbe anyị ga-esi nʼụwa pụọ.
8Ya mere, ọ bụrụ na anyị enwe ihe oriri na uwe anyị ji ekpuchi ọtọ anyị, afọ kwesiri iju anyị nʼihe anyị nwere.
9Ma ndị na-achọ ịba ọgaranya na-adaba nʼọnwụnwa na nʼime ọnya na ọtụtụ ihe nzuzu na ọchịchọ ọjọọ niile dị iche iche nke na-enubanye ha nʼịla nʼiyi na mbibi.