2 Ihe E Mere 1

Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”

2 Chronicles 1:10 (UKJV) Give me now wisdom and knowledge, that I may go out and come in before this people: for who can judge this your people, that is so great?

8Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya

9Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala.

10Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”

11Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha.

12Ya mere, enyela gị amamihe na nghọta dịka ị rịọrọ. Aga m enyekwa gị akụnụba na nsọpụrụ dị ukwuu, nke eze ọbụla nke buru gị ụzọ na-enwebeghị. Ọ dịkwaghị onye nke ga-eso gị ga-enwe ụdị ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.