7Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”
8Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya
9Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala.
10Biko, nye m amamihe na nghọta, nke m ga-eji edu ndị a napụ na-abata, nʼihi na onye pụrụ ịchịkọta ndị gị a dị ukwuu?”
11Chineke zara Solomọn sị ya, “Ebe ọ bụ na ị rịọghị m ka m nye gị akụnụba, maọbụ ogologo ndụ; ebe ọ bụkwa na ị rịọghị m ka m mee ka ndị kpọrọ gị asị nwụsịa, maọbụ ka m mee ka i nwee nsọpụrụ karịa, kama mkpa na-akpa gị bụ ka m nye gị amamihe na nghọta ị ga-eji duzie ndị m, nke m mere gị eze ha.