2 Ihe E Mere 1

Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”

2 Chronicles 1:7 (UKJV) In that night did God appear unto Solomon, and said unto him, Ask what I shall give you.

5Ebe ịchụ aja bronz ahụ Bezalel nwa Uri, nwa Hua wuru dịkwa na Gibiọn, nʼihu ụlọ nzute Onyenwe anyị. Solomọn na ọgbakọ ahụ na-ajụta ya ase nʼebe bronz ahụ.

6Solomọn jere nʼebe ịchụ aja ahụ e ji bronz kpụọ, nke dị nʼihu Onyenwe anyị, nʼime ụlọ nzute, jiri anụ ụlọ ọnụọgụgụ ha dị otu puku chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ya.

7Nʼabalị ụbọchị ahụ na Gibiọn, Onyenwe anyị mere ka Solomọn hụ ya anya, sị ya, “Rịọọ ihe ọbụla ị chọrọ ka m nye gị.”

8Ma Solomọn zara Chineke, sị, “I gosila nna m bụ Devid obi ebere dị ukwuu. Ugbu a, i meekwala m eze nʼọnọdụ ya

9Ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke, ka nkwa gị nke i kwere nna m, bụ Devid, bụrụ ihe e mezuru, nʼihi na ị meela m eze ndị a bara ụba nʼọnụọgụgụ dịka aja nke ala.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.