2 Ihe E Mere 12

Ndị ndu Izrel na eze wedara onwe ha nʼala sị, “Onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ.”

2 Chronicles 12:6 (UKJV) Whereupon the princes of Israel and the king humbled themselves; and they said, The LORD is righteous.

4O merikwara obodo niile e wusiri ike nke Juda ma bịarukwaa Jerusalem.

5Mgbe ahụ, Shemaya onye amụma bịakwutere Rehoboam na ndịisi Juda niile, ndị zukọtara na Jerusalem nʼihi egwu Shishak, sị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, ‘Unu ahapụla m, nʼihi ya, ahapụkwala m unu, nyefee unu nʼaka Shishak.’ ”

6Ndị ndu Izrel na eze wedara onwe ha nʼala sị, “Onye ezi omume ka Onyenwe anyị bụ.”

7Mgbe Onyenwe anyị hụrụ otu ha si weda onwe ha nʼala, okwu Onyenwe anyị bịakwutere Shemaya, sị, “Ebe ọ bụ na ha ewedala onwe ha nʼala, agakwaghị m ebibi ha kama aga m eme ka ha nwe nzọpụta ngwangwa. Agakwaghị m eji Shishak gosi Jerusalem oke iwe m.

8Ma otu ọ dị, ha ga-abụrụ ya ohu, ka ha nwe ike mata ọ dị iche dị nʼetiti ijere m ozi na ijere ndị eze ala ọzọ dị iche iche ozi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.