2 Ihe E Mere 13

Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda.

2 Chronicles 13:16 (UKJV) And the children of Israel fled before Judah: and God delivered them into their hand.

14Mgbe ndị agha Juda tụgharịrị hụ na agha dị ha nʼihu dịkwa nʼazụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu nzọpụta, ndị nchụaja fụkwara opi ike ha.

15Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel.

16Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda.

17Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ.

18Ya mere, ntụkwasị obi nke Juda nwere nʼime Onyenwe anyị Chineke nna ha mere ka ha merie Jeroboam na ndị Izrel.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.