2 Ihe E Mere 13

Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel.

2 Chronicles 13:15 (UKJV) Then the men of Judah gave a shout: and as the men of Judah shouted, it came to pass, that God stroke Jeroboam and all Israel before Abijah and Judah.

13Ma Jeroboam ezipụlarị ụfọdụ ndị agha ya ka ha ga ndị agha Juda nʼazụ. Mgbe Jeroboam nọ nʼihu ndị Juda, ụfọdụ ndị agha ya nọkwa ndị Juda nʼazụ.

14Mgbe ndị agha Juda tụgharịrị hụ na agha dị ha nʼihu dịkwa nʼazụ, ha tikuru Onyenwe anyị mkpu nzọpụta, ndị nchụaja fụkwara opi ike ha.

15Ndị Juda tiri oke mkpu agha. Mgbe ha na-eti mkpu a, Chineke mere ka Abija na ndị Juda merie Jeroboam na ndị Izrel.

16Ndị agha Izrel gbara ọsọ nʼihu ndị Juda, Chineke nyefere ha nʼaka ndị Juda.

17Abija na ndị agha ya gburu narị puku ndị Izrel ise nʼụbọchị ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.