2 Ihe E Mere 13

Ma unu achụpụghị ndị nchụaja Onyenwe anyị, bụ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livayị ma meere onwe unu ndị nchụaja dịka ndị mba ọzọ na-eme? Onye ọbụla ji nwa oke ehi na ebule asaa bịa ido onwe ya nsọ na-aghọrọ unu onye nchụaja nye ihe ndị ahụ na-abụghị chi.

2 Chronicles 13:9 (UKJV) Have all of you not cast out the priests of the LORD, the sons of Aaron, and the Levites, and have made you priests after the manner of the nations of other lands? so that whosoever comes to consecrate himself with a young bullock and seven rams, the same may be a priest of them that are no gods.

7Ndị efu niile na-abaghị uru chịkọtara onwe ha gbaa ya gburugburu guzogide Rehoboam nwa Solomọn, mgbe ọ bụ nwantakịrị na onye na-enweghị ike inwe mkpebi, onye nʼadịghịkwa ike iguzogide ha.

8“Ma ugbu a, unu ejikerela imegide alaeze Onyenwe anyị nke dị nʼaka ụmụ ụmụ Devid. Nʼezie, unu bu igwe ndị agha bara ụba, nʼetiti unu ka ụmụ ehi ọlaedo ahụ dịkwa, bụ nke Jeroboam mere ka ha buru chi unu.

9Ma unu achụpụghị ndị nchụaja Onyenwe anyị, bụ ụmụ Erọn, chụpụkwa ndị Livayị ma meere onwe unu ndị nchụaja dịka ndị mba ọzọ na-eme? Onye ọbụla ji nwa oke ehi na ebule asaa bịa ido onwe ya nsọ na-aghọrọ unu onye nchụaja nye ihe ndị ahụ na-abụghị chi.

10“Ma banyere anyị, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, anyị ahapụbeghị ya. Ndị nchụaja na-ejere Onyenwe anyị ozi bụ ụmụ Erọn, ndị Livayị bụkwa ndị na-enyere ha aka.

11Ha na-achụ aja nye Onyenwe anyị kwa ụtụtụ na anyasị niile, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; ma na-edobekwa achịcha edoro nsọ nʼelu tebul ahụ dị ọcha. Ha na-amụnyekwa ọkụ nʼiheọkụ ndị ahụ dị nʼelu ihe ịdọba oriọna ọlaedo kwa abalị niile. Nʼihi na anyị onwe anyị na-edebe iwu Onyenwe anyị Chineke anyị; ma unu onwe unu ahapụla ya, gbakụta ya azụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.