2 Ihe E Mere 14

Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu Onyenwe anyị dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ.

2 Chronicles 14:14 (UKJV) And they stroke all the cities round about Gerar; for the fear of the LORD came upon them: and they spoiled all the cities; for there was exceeding much spoil in them.

12Onyenwe anyị tigbukwara ndị Kush niile ahụ nʼihu Asa na Juda. Ndị Kush gbakwara ọsọ.

13Asa na ndị agha ya chụrụ ha ọsọ chụruo ha obodo Gera ebe ọtụtụ ndị Kush dara, ruo na o nwekwaghị onye fọdụrụ ndụ nʼime ha. E tigburu ha nʼihu Onyenwe anyị na ndị agha ya. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼagha dị iche iche.

14Ha bibiri obodo niile gbara Gera gburugburu, nʼihi na egwu Onyenwe anyị dakwasịrị obodo ndị ahụ niile. Ndị Juda bukọọrọ ọtụtụ ihe nkwata nʼihi na ọtụtụ ihe dị nʼobodo ndị ahụ.

15Ha busokwara ebe obibi ndị na-azụ anụ ụlọ agha, chikọrọ igwe atụrụ na ewu na ịnyịnya kamel. Emesịa ha laghachiri Jerusalem.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.