8Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.
9Mgbe ahụ, Asa kpọrọ ndị Juda na Benjamin niile oku, ha na ndị ọbịa niile si Izrel, nʼihi na ọtụtụ sitere nʼala Ifrem na Manase, na Simiọn gbafeta Juda, mgbe ha hụrụ na Onyenwe anyị Chineke nọnyeere Asa.
10Ha niile zukọrọ na Jerusalem nʼọnwa nke atọ nʼafọ nke iri na ise nke ọchịchị eze Asa.
11Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha.
12Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe.