2 Ihe E Mere 15

Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye.

2 Chronicles 15:13 (UKJV) That whosoever would not seek the LORD God of Israel should be put to death, whether small or great, whether man or woman.

11Nʼoge ahụ, ha ji narị ehi asaa na puku atụrụ na ewu asaa, chụọrọ Onyenwe anyị aja nʼụbọchị ahụ. Anụmanụ ndị a so nʼihe ha kwatara nʼagha.

12Emesịa, nʼụbọchị ahụ, ha gbara ndụ, kpebie na ọ bụ naanị Onyenwe anyị Chineke nna ha ka ha ga-efe.

13Ha kpebikwara na onye ọbụla nke na-agaghị efe Onyenwe anyị, Chineke Izrel ga-anwụ, ma onye ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị, nwantakịrị maọbụ okenye.

14Ha niile ji oke olu na iti mkpu na opi na opi ike, ṅụọrọ Onyenwe anyị iyi.

15Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.