15Ndị Juda niile ṅụrịrị ọṅụ nʼihi na ha ji obi ha niile ṅụọ iyi a. Ha jikwa obi ha niile chọọ Chineke. O mere ka ha chọta ya. Onyenwe anyị nyekwara ha udo nʼakụkụ niile.
16Eze Asa chụdakwara nne nne ya bụ Maaka, site nʼọnọdụ ya dịka nne eze, nʼihi na ọ kpụrụ ihe arụ, ogidi Ashera maka iji fee ya ofufe. Asa gbuturu ya, sụpịa ya, kpọọ ya ọkụ na ndagwurugwu iyi Kidrọn.
17Ọ bụ ezie na o wezugaghị ugwu niile dị elu site nʼIzrel, ma Asa ji obi zuruoke jere Onyenwe anyị ozi nʼoge ndụ ya niile
18O webatara nʼime ụlọnsọ ukwu Chineke, ọlaọcha na ọlaedo na ihe niile, nke nna ya na ya onwe ya doro nsọ.
19Ọ dịkwaghị agha ọzọ a lụrụ tutu ruo nʼafọ iri atọ na ise nke ọchịchị eze Asa na Juda.