2 Ihe E Mere 15

Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha.

2 Chronicles 15:6 (UKJV) And nation was destroyed of nation, and city of city: for God did vex them with all adversity.

4Ma mgbe ọbụla ha chigharịkwutere Onyenwe anyị, Chineke Izrel tikuo ya nʼime mkpagbu ha, ọ na-enyere ha aka.

5Nʼoge ahụ, ọ dịghị udo dịrị onye ọbụla na-apụ apụ ịgagharị nʼobodo, maka na ndị niile bi nʼala ahụ nọ nʼọnọdụ oke ọgbaaghara.

6Otu obodo na-azọpịa obodo ọzọ ebe otu mba na-emegidekwa mba ọzọ nʼihi na Chineke ji nsogbu dị iche iche megide ha.

7Ma unu ndị Juda, unu adala mba nʼọrụ ọma unu, nʼihi na a ga-akwụ unu ụgwọ ọrụ unu.”

8Mgbe Asa nụrụ okwu ndị a, bụ amụma Azaraya nwa Oded, ọ bụ onye a gbara ume. O wepụrụ ihe arụ niile dị nʼala Juda na Benjamin na nke dị nʼobodo niile ahụ o meriri nʼagha ndị dị nʼugwu Ifrem. Ọ wuziri ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, nke dị nʼihu mpụta ọnụ ụlọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.