2 Ihe E Mere 17

Onyenwe anyị nọnyeere Jehoshafat nʼihi na o sooro nzọ ụkwụ nna ya, bụ Devid, onye buuru ya ụzọ chịa. Ọ jụghị ase site nʼaka Baal,

2 Chronicles 17:3 (UKJV) And the LORD was with Jehoshaphat, because he walked in the first ways of his father David, and sought not unto Baalim;

1Jehoshafat nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya, o mere onwe ya ka ọ dị ike imegide Izrel.

2O tinyere ụfọdụ ndị agha ya nʼobodo niile dị na Juda e wusiri ike, tinyekwa ụfọdụ nʼobodo ndị ọzọ dị nʼIfrem, na ebe ndị ọzọ niile nke nna ya, Asa meriri nʼagha.

3Onyenwe anyị nọnyeere Jehoshafat nʼihi na o sooro nzọ ụkwụ nna ya, bụ Devid, onye buuru ya ụzọ chịa. Ọ jụghị ase site nʼaka Baal,

4kama ọ chọrọ Onyenwe anyị, Chineke nna ya, dobekwa iwu ya niile, ọ bụghịkwa dịka omume ndị Izrel si dị.

5Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.